
Okwu Nmalite
Subakwa Igbo, nke a bụ otu okwu eji mara Maazi Peter Obi mgbe ọ bụrụ áka na-achị Stet Anambra. Ugwumagala sị, na ya gaghị ekwo na ọhịa na-agba ọkụ ghara ịga ije ọgaranya nna ya ha kuziri ya. Ọnụọgụ mmadụ ole na-asụdị asụsụ Hibru n’ụwa? Ma ana-eji Hibru akuzi nkuzi na mahadum n’ala Israel. Akwụkwọ Mkpụrụokwu Igbo a chọrọ inye áka kwalite Ụtọasụsụ anyị.
Ọ bụ nkụ nọ na mba na-eghere mba nri. Asụsụ Igbo abụghị sọsọ njirimara Ndịigbo, ọ bụkwa ihe na-egboro ha mkpa kwa ụbọchị, etu asụsụ obodo ndị ọzọ sikwa eme. Echiche nkete echere eche, ma okwu ọnụ na-esota ya, na-agba ezigbo ama ebe mmadụ siri hiri. N’ezie ngwere hapụ ukwu osisi áka akpara ya. Ya mere ngalaba amụmamụ dị iche iche ga-eji teta n’ụra, nabata akamgba a chere anyị niile, ma ọnọnaụlọ ma ọnọnaụzọ ije.
Asụsụ ndị ọzọ machakwara mma, kama nke ọbụla bụ mpio ụwa ji ahụ ụzọ. Njirimara ụtọasụsụ Igbo pụrụiche, naanị mkpọtụ ya pụrụ ịgụpe ụzọ; ìhè o na-enye ga-abara anyị uru, bakwara ndị ọzọ. Ya mere Gọrment Nigeria na Equitorial Guineau jiri were Igbo dịka Asụsụ ọha ha, n’agbanyeghị na Gabon na Cameroun jikwa ụda asụsụ a kpọrọ ezigbo ihe. Lekwa: Mpkụrụokwu Igbo, lekwa: Igbothesaurus.com